Luk 12

Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”

Luke 12:34 (UKJV) For where your treasure is, there will your heart be also.

32“Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ.

33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.

34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”

35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.

36Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.