Luk 12

“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.

Luke 12:35 (UKJV) Let your loins be girded about, and your lights burning;

33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.

34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”

35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.

36Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka.

37Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.