Luk 12

Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ.

Luke 12:52 (UKJV) For from henceforth there shall be five in one house divided, three against two, and two against three.

50Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya

51Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa.

52Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ.

53Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.”

54Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.