48Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.
49“A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu!
50Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya
51Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa.
52Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ.