Luk 12

Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa.

Luke 12:51 (UKJV) Suppose all of you that I am come to give peace on earth? I tell you, Nay; but rather division:

49“A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu!

50Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya

51Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa.

52Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ.

53Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.