28“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya?
29Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị,
30na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’
31“Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ?
32Ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-ezipụ ozi rịọ ka e kpee udo mgbe onye nke ọzọ ka nọ nʼebe dị anya.