Luk 16

Ọ dị mfe ka eluigwe na ụwa gabiga karịa na a ga-ewepụ otu kpọm, site nʼihe niile dị nʼiwu.

Luke 16:17 (UKJV) And it is easier for heaven and earth to pass, than one tittle of the law to fail.

15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.

16“Iwu na ndị amụma nọ na-achị ruo oge Jọn bịara. Site nʼoge ahụ, a na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, onye ọbụla na-ejikwa ike na-abanye nʼime ya.

17Ọ dị mfe ka eluigwe na ụwa gabiga karịa na a ga-ewepụ otu kpọm, site nʼihe niile dị nʼiwu.

18“Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko.

19“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.