17Ọ dị mfe ka eluigwe na ụwa gabiga karịa na a ga-ewepụ otu kpọm, site nʼihe niile dị nʼiwu.
18“Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko.
19“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile.
20Nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, otu nwoke onye ogbenye nke ọnya juru ahụ ya na-edina nʼebe ahụ. Aha ya bụ Lazarọs.
21Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ.