Luk 16

Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ.

Luke 16:21 (UKJV) And desiring to be fed with the crumbs which fell from the rich man's table: moreover the dogs came and licked his sores.

19“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile.

20Nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, otu nwoke onye ogbenye nke ọnya juru ahụ ya na-edina nʼebe ahụ. Aha ya bụ Lazarọs.

21Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ.

22“Mgbe onye ogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nʼebe Ebraham nọ. Onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.

23Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.