2Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’
3“Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ.
4Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’
5“Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’
6“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’