1Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi.
2Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’
3“Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ.
4Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’