Luk 16

“Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’

Luke 16:7 (UKJV) Then said he to another, And how much owe you? And he said, An hundred measures of wheat. And he said unto him, Take your bill, and write fourscore.

5“Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’

6“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’

7“Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’

8“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè.

9Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.