14Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.
15Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke.
16Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
17Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ?
18Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?”