32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.”
33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya.
34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ.
35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”
36O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa.