30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị,
31nke i kwadoro nʼihu mba niile.
32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.”
33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya.
34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ.