35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”
36O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa.
37Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere.
38Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem.
39Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili.