42Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.
43Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta.
44Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha.
45Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya.
46Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe ọ nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ.