Luk 22

Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.

Luke 22:28 (UKJV) All of you are they which have continued with me in my temptations.

26Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.

27Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.

28Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.

29Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.

30Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.