27Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.
28Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
29Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.
30Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
31“Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti.