28Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
29Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.
30Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
31“Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti.
32Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.”