32Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?”
33Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe,
34na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.”
35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”