21Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere.
22Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
23Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli;
24Heli abụrụ nwa Matat, nwa Livayị, nwa Meliki, nwa Janayi, nwa Josef;
25nwa Matatiyas, nwa Emọs, nwa Nehum, nwa Esili, nwa Nagayị;