49Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.”
50Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, “Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya.”
51Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ.
52Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, “Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.”
53Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ.