8Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ.
9Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya.
10Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha.
11Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.
12Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.”