Luk 9

Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.

Luke 9:11 (UKJV) And the people, when they knew it, followed him: and he received them, and spoke unto them of the kingdom of God, and healed them that had need of healing.

9Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya.

10Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha.

11Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.

12Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.”

13Ọ zara ha sị, “Unu nye ha nri ka ha rie.” Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.