Malakaị 1

Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Malachi 1:11 (UKJV) For from the rising of the sun even unto the going down of the same my name shall be great among the Gentiles; and in every place incense shall be offered unto my name, and a pure offering: for my name shall be great among the heathen, says the LORD of hosts.

9“Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

10“Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka.

11Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

12“Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị.

13Unu na-ekwukwa, ‘Nke a bụ ihe ike ọgwụgwụ,’ si otu a na-eduli imi unu elu nʼebe m nọ nʼọnọdụ oke nlelị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Mgbe unu na-ewebata ihe a natara nʼike, na nke dara ngwụrọ, na nke na-arịa ọrịa, jiri ha chụọrọ m aja, o kwesiri ka m nabata ya?” Ka Onyenwe anyị na-ekwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.