Malakaị 1

“Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

Malachi 1:9 (UKJV) And now, I pray you, plead to God that he will be gracious unto us: this has been by your means: will he regard your persons? says the LORD of hosts.

7“Unu na-eji anụ rụrụ arụ na-achụrụ m aja nʼelu ebe ịchụ aja m. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si merụọ ya?’ “Ọ bụ mgbe unu na-asị na tebul Onyenwe anyị bụ ihe e kwesiri ileda anya.

8Mgbe unu ji anụ ndị kpuru ìsì achụrụ m aja, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi ka unu na-eme? Mgbe unu na-ejikwa ndị dara ngwụrọ, na anụ na-arịa ọrịa, ọ bụghị ihe ọjọọ ka unu na-eme? Werenụ anụ ndị a bugara onye na-achị obodo unu dịka onyinye. Ọ ga-atọ ya ụtọ ịnabata onyinye dị otu a? Ọ ga-anabata unu?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

9“Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

10“Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka.

11Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.