Malakaị 1

“Onye a na-abụ ọnụ ka onye aghụghọ ahụ bụ nke nwere oke nʼigwe ewu na atụrụ ya, kwee nkwa inye ya, ma mesịa were anụ nwere ntụpọ chụọrọ Onyenwe anyị aja. Nʼihi na mụ onwe m bụ Eze ukwu ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “aha m bụkwa ihe a ga-atụ egwu nʼetiti mba dị iche iche.

Malachi 1:14 (UKJV) But cursed be the deceiver, which has in his flock a male, and vows, and sacrifices unto the LORD a corrupt thing: for I am a great King, says the LORD of hosts, and my name is dreadful among the heathen.

12“Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị.

13Unu na-ekwukwa, ‘Nke a bụ ihe ike ọgwụgwụ,’ si otu a na-eduli imi unu elu nʼebe m nọ nʼọnọdụ oke nlelị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Mgbe unu na-ewebata ihe a natara nʼike, na nke dara ngwụrọ, na nke na-arịa ọrịa, jiri ha chụọrọ m aja, o kwesiri ka m nabata ya?” Ka Onyenwe anyị na-ekwu.

14“Onye a na-abụ ọnụ ka onye aghụghọ ahụ bụ nke nwere oke nʼigwe ewu na atụrụ ya, kwee nkwa inye ya, ma mesịa were anụ nwere ntụpọ chụọrọ Onyenwe anyị aja. Nʼihi na mụ onwe m bụ Eze ukwu ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “aha m bụkwa ihe a ga-atụ egwu nʼetiti mba dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.