Malakaị 1

Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ”

Malachi 1:5 (UKJV) And your eyes shall see, and all of you shall say, The LORD will be magnified from the border of Israel.

3ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.”

4Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.” Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi.

5Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ”

6“Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na asọpụrụkwa onyenwe ya. A sị na m bụ nna, ebee ka egwu m dị. A sị na m bụ onyenwe mmadụ, ebee ka nsọpụrụ m dị?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ọ bụ unu ndị nchụaja na-eleda aha m anya. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si eleda aha gị anya?’

7“Unu na-eji anụ rụrụ arụ na-achụrụ m aja nʼelu ebe ịchụ aja m. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si merụọ ya?’ “Ọ bụ mgbe unu na-asị na tebul Onyenwe anyị bụ ihe e kwesiri ileda anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.