Malakaị 1

ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.”

Malachi 1:3 (UKJV) And I hated Esau, and laid his mountains and his heritage waste for the dragons of the wilderness.

1Okwu amụma: Nke a bụ okwu Onyenwe anyị gwara Izrel site nʼọnụ Malakaị onye amụma.

2“Ahụla m unu nʼanya,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’ “Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya,

3ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.”

4Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.” Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi.

5Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.