8Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
9“Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.”
10Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị?
11Juda ekwesighị ntụkwasị obi. E meela ihe arụ nʼIzrel na nʼime Jerusalem: Juda emerụọla ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị hụrụ nʼanya, lụọkwa ada chi ndị mba ọzọ.
12Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye.