Malakaị 2

Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Malachi 2:8 (UKJV) But all of you are departed out of the way; all of you have caused many to stumble at the law; all of you have corrupted the covenant of Levi, says the LORD of hosts.

6Iwu nke eziokwu dị ya nʼọnụ, ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a chọpụtara nʼegbugbere ọnụ ya. O soro m jee ije nʼudo, na nʼịkwụba aka ọtọ. O mekwara ka ọtụtụ si nʼajọ omume ha chigharịa.

7“Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

8Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

9“Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.”

10Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.