11“Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
12“Mgbe ahụ, mba niile dị iche iche ga-akpọ unu ndị a gọziri agọzi, nʼihi na ala unu ga-abụ nke na-enye ndị nwe ya obi ụtọ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
13Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.” “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’
14“Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile?
15Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ”