13Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.” “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’
14“Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile?
15Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ”
16Mgbe ahụ, ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị gwarịtara ibe ha okwu, Onyenwe anyị ṅara ntị, nụkwa ihe ha na-ekwu. Nʼihu ya, e nwere akwụkwọ ncheta dị ya, ebe e dere aha ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma na-echekwa echiche banyere aha ya.
17“Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “ha ga-abụ ihe oke ọnụahịa nke aka m. Aga m echebe ha, dịka nna na-enwe ọmịiko ma chebekwa nwa ya nwoke na-efe ya.