Malakaị 3

“Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa.

Malachi 3:2 (UKJV) But who may abide the day of his coming? and who shall stand when he appears? for he is like a refiner's fire, and like fullers' soap:

1“Lee, aga m ezipu onyeozi m, onye ga-edozi ụzọ nʼihu m. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ahụ unu na-ele anya ya ga-abịa na mberede nʼụlọnsọ ukwu ya. Onyeozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-agụsị unu agụụ ike, ga-abịa,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

2“Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa.

3Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye nʼezi omume.

4Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye Onyenwe anyị ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.