3Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye nʼezi omume.
4Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye Onyenwe anyị ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga.
5“Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
6“Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị adịghị agbanwe agbanwe. Ya mere, unu bụ ụmụ Jekọb ji dịgide.
7Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’