Malakaị 3

Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’

Malachi 3:7 (UKJV) Even from the days of your fathers all of you are gone away from mine ordinances, and have not kept them. Return unto me, and I will return unto you, says the LORD of hosts. But all of you said, Wherein shall we return?

5“Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

6“Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị adịghị agbanwe agbanwe. Ya mere, unu bụ ụmụ Jekọb ji dịgide.

7Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’

8“Mmadụ ọ na-ezu ihe bụ nke Chineke nʼohi? Ma unu apụnarịla m ihe bụ nke m. “Ma unu na-ajụ: ‘Anyị si aṅaa na-ezu gị ohi?’ “Ọ bụ site nʼotu ụzọ nʼime ụzọ iri unu, onyinye na aja niile.

9Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.