Mak 11

Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.”

Mark 11:17 (UKJV) And he taught, saying unto them, Is it not written, My house shall be called of all nations the house of prayer? but all of you have made it a den of thieves.

15Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru.

16O gbochikwara onye ọbụla iwebata ngwongwo ahịa orire nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ.

17Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.”

18Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya.

19Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.