32Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya.
33Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.”
34Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
35Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid?
36Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’