Mak 12

Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’

Mark 12:36 (UKJV) For David himself said by the Holy Spirit, The LORD said to my Lord, Sit you on my right hand, till I make yours enemies your footstool.

34Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.

35Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid?

36Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’

37Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.

38Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.