9Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha.
10Ngwangwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼakụkụ obodo Dalmanuta.
11Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya.
12Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.”
13Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.