Mak 8

Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”

Mark 8:4 (UKJV) And his disciples answered him, From whence can a man satisfy these men with bread here in the wilderness?

2“Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri.

3Ọ bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa.”

4Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”

5Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.”

6Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.