4Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”
5Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.”
6Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.
7Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya.
8Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa.