17“ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’
18Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
19Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”
20Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị.
21“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi.