35Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala.
36O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ.
37Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa.
38Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị.
39Mgbe o zilagara igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nʼobodo Magadan.