12“Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’
13“Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.
14“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka.
15O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya.
16Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru.