Matiu 25

Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.

Matthew 25:18 (UKJV) But he that had received one went and dug in the earth, and hid his lord's money.

16Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru.

17Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru.

18Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.

19“Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya.

20Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.