11Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.
12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem
13Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
14Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye mgbe unu na-agbapụ ọsọ. Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ nye ndị eze Izrel.
15Aga m akpọbata onye ga-emeri unu ndị bi na Maresha nʼagha. Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel ga-agbabanye nʼAdulam.