12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem
13Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
14Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye mgbe unu na-agbapụ ọsọ. Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ nye ndị eze Izrel.
15Aga m akpọbata onye ga-emeri unu ndị bi na Maresha nʼagha. Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel ga-agbabanye nʼAdulam.
16Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu, meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele, nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.