Maika 1

Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata

Micah 1:4 (UKJV) And the mountains shall be molten under him, and the valleys shall be cleft, as wax before the fire, and as the waters that are poured down a steep place.

2Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.

3Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.

4Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata

5Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb, nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel. Gịnị bụ njehie Jekọb? Ọ bụghị Sameria? Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda? Ọ bụghị Jerusalem?

6“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe, ebe a na-akụ osisi vaịnị. Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu, mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.